Lamentations 5

1Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị;
leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.
2E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka,
werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.
3Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna.
Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.
4Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ.
Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.
5Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ,
ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.
6Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka
nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.
7Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla.
Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.
8Ndị bụ ohu na-achị anyị.
Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.
9Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri,
nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.
10Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,
Ite ọkụ a, bụ nke eji eghe ihe dịka achịcha maọbụ amịkpọ anụ na ihe ndị ọzọ

na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.
11Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn,
ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.
12Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu;
a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.
13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri,
ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.
14Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama,
ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.
15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị;
ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ.
Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.
17Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba,
nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.
18Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,
nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.

19Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
20Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?
Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?
21Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;
gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,
22ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam
na-eweso anyị iwe nke ukwu.
Copyright information for IboBIU